Hosiya 10:3
Hosea 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, ha ga-asị, “Anyị enweghị eze, nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu, ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?”
Hosea 10:3 in English
Hosea 10:3 · Berean Standard Bible
Surely now they will say, “We have no king, for we do not revere the LORD. What can a king do for us?”
Context
1Izrel bụ osisi vaịnị dị mma,
nke na-amịta mkpụrụ nke ukwuu.
Dịka mkpụrụ ya na-aba ụba,
otu a ka o si amụba ebe ịchụ aja ya.
Dịka ala ya na-abawanyekwa ụba
otu a ka o si edoziri onwe ya nkume dị nsọ. 2Obi ha dị aghụghọ,
ma ugbu a, ha ga-ata ahụhụ maka ikpe ọmụma ha.
Onyenwe anyị ga-akwatu ebe nchụaja ha,
ma mebikwaa ogidi nkume nsọ ha niile. 3Ma ugbu a, ha ga-asị,
“Anyị enweghị eze,
nʼihi na anyị anaghị atụ Onyenwe anyị egwu,
ma olee ihe eze nwere ike ị mere anyị?” 4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru,
were ịṅụ iyi
na-agbakwa ndụ,
ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile,
dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ
nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.*
Ndị ya ga-eruru ya ụjụ,
otu a kwa ka ndị nchụaja ya
rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ,
maka ebube nke a napụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.