Native Bible

Hosea 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ.

Hosea 10:6 in English

Hosea 10:6 · Berean Standard Bible

Yes, it will be carried to Assyria as tribute to the great king.* Ephraim * will be seized with shame; Israel will be ashamed of its wooden idols.*

Context

4Ha na-ekwu okwu na-abaghị uru, were ịṅụ iyi na-agbakwa ndụ, ya mere ikpe ikpe jiri jupụta nʼebe niile, dịka ahịhịa ọjọọ nʼubi. 5Ndị bi na Sameria ga-atụ ụjọ nʼihi chi nke nwa ehi a kpụrụ akpụ dị na Bet-Aven.* Ndị ya ga-eruru ya ụjụ, otu a kwa ka ndị nchụaja ya rụrụ arụ ga-esi ruoru ya ụjụ, maka ebube nke a napụrụ ya. 6Ha ga-eburu ha gaa Asịrịa, dịka onyinye ịnata ihuọma a ga-enye eze ukwu ahụ. A ga-emenye Ifrem ihere nʼihu, Izrel ga-ekpudokwa ihu nʼala maka mmekọrịta ya na ndị mba ọzọ. 7A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,* ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.