Native Bible

Hosea 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?

Hosea 10:9 in English

Hosea 10:9 · Berean Standard Bible

Since the days of Gibeah you have sinned, O Israel, and there you have remained. Did not the battle in Gibeah overtake the sons of iniquity?*

Context

7A ga-ala eze Sameria nʼiyi dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,* ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel, ogwu na uke ga-etolitekwa, nʼebe nchụaja ha. Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!” Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!” 9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea? 10Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ; mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha, taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha. 11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.