Hosiya 10:9
Hosea 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie, i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị. Ọ bụ na agha agaghị eri ha bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea?
Hosea 10:9 in English
Hosea 10:9 · Berean Standard Bible
Since the days of Gibeah you have sinned, O Israel, and there you have remained. Did not the battle in Gibeah overtake the sons of iniquity?*
Context
7A ga-ala eze Sameria nʼiyi
dịka irighiri osisi nʼelu mmiri niile, 8a ga-ebibicha ebe niile dị elu nke ihe ọjọọ, bụ Aven,*
ọ bụ ya bụ mmehie ndị Izrel,
ogwu na uke ga-etolitekwa,
nʼebe nchụaja ha.
Mgbe ahụ ha ga-asị, ugwu ukwu niile, “Kpuchite anyị!”
Sịkwa ugwu nta niile, “Dakwasị anyị!” 9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie,
i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị.
Ọ bụ na agha agaghị eri ha
bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea? 10Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ;
mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha,
taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha. 11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ
nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,
nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu
nʼolu ọma ya ahụ.
Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,
Juda aghaghị ịkọ ala ubi
Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.