Hosiya 10:11
Hosea 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya, nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu nʼolu ọma ya ahụ. Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya, Juda aghaghị ịkọ ala ubi Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya.
Hosea 10:11 in English
Hosea 10:11 · Berean Standard Bible
Ephraim is a well-trained heifer that loves to thresh; but I will place a yoke on her fair neck. I will harness Ephraim, Judah will plow, and Jacob will break the hard ground.
Context
9“Site nʼụbọchị nke Gibea, gị Izrel nọ na mmehie,
i nwebeghị ike site na mmehie ndị a wezuga onwe gị.
Ọ bụ na agha agaghị eri ha
bụ ndị na-eme ajọọ omume na Gibea? 10Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ;
mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha,
taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha. 11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ
nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,
nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu
nʼolu ọma ya ahụ.
Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,
Juda aghaghị ịkọ ala ubi
Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya. 12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu,
unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya.
Kọgharịakwanụ obi unu siri ike,
nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ bịara
wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume. 13Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume;
unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi.
Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha.
Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu,
na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.