Hosiya 10:12
Hosea 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu, unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya. Kọgharịakwanụ obi unu siri ike, nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ bịara wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume.
Hosea 10:12 in English
Hosea 10:12 · Berean Standard Bible
Sow for yourselves righteousness and reap the fruit of loving devotion; break up your unplowed ground. For it is time to seek the LORD until He comes and sends righteousness upon you like rain.
Context
10Aga m abịa buso ndị mmehie a agha, nye ya ahụhụ;
mba ndị ọzọ ga-ebilite megide ha,
taa ha ahụhụ nʼihi ajọ omume abụọ ha. 11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ
nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,
nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu
nʼolu ọma ya ahụ.
Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,
Juda aghaghị ịkọ ala ubi
Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya. 12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu,
unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya.
Kọgharịakwanụ obi unu siri ike,
nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ bịara
wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume. 13Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume;
unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi.
Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha.
Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu,
na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu. 14Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu,
ebe unu niile e wusiri ike ga-ada.
Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha,
mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.