Hosiya 10:13
Hosea 10:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume; unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi. Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha. Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu, na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu.
Hosea 10:13 in English
Hosea 10:13 · Berean Standard Bible
You have plowed wickedness and reaped injustice; you have eaten the fruit of lies. Because you have trusted in your own way and in the multitude of your mighty men,
Context
11Ifrem bụ nne ehi a zụrụ azụ
nke hụrụ ịzọcha ọka nʼanya,
nʼihi ya, M ga-ekonye ịyagba nʼolu
nʼolu ọma ya ahụ.
Aga m agba Ifrem dịka ịnyịnya,
Juda aghaghị ịkọ ala ubi
Jekọb ga-akọze ala nye onwe ya. 12Ya mere, ghaanụ mkpụrụ ezi omume maka onwe unu,
unu ga-aghọtakwa mkpụrụ ịhụnanya.
Kọgharịakwanụ obi unu siri ike,
nʼihi na ugbu a bụ oge ịchọ Onyenwe anyị,
tutu ruo mgbe ọ bịara
wụkwasị unu mmiri ozuzo dịka ezi omume. 13Ma unu akụọla mkpụrụ ajọ omume;
unu aghọtakwala ihe ọjọọ dịka ihe ubi.
Unu eriela mkpụrụ osisi ụgha.
Nʼihi na unu atụkwasịla obi unu nʼịdị ike nke onwe unu,
na nʼịdị ọtụtụ nke ndị bụ dike nʼagha unu. 14Nʼihi ya, ụzụ nke ibu agha aghaghị ibili nʼetiti unu,
ebe unu niile e wusiri ike ga-ada.
Ọ ga-ada dịka Shalman si bibie Bet Abel nʼụbọchị agha,
mgbe a tụpịara ndị bụ nne na ụmụ ha. 15Ọ bụ ihe dị otu a ga-adakwasị gị, Betel,
nʼihi na ajọ omume gị dị ukwuu.
Mgbe chi ụbọchị ahụ bọrọ,
a ga-ala eze Izrel nʼiyi kpamkpam.
10:5 Bet-Aven pụtara ụlọ ihe ajọ aha ịkwa emo Betel; Betel nke pụtara ụlọ Chineke
10:8 Aven, na-ekwu banyere Bet-Aven aha ịkwa emo na-akpọ Betel
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.