Jenesis 6:9
Genesis 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya. Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya.
Genesis 6:9 in English
Genesis 6:9 · Berean Standard Bible
This is the account of Noah. Noah was a righteous man, blameless in his generation; Noah walked with God.
Context
7Nʼihi ya, Onyenwe anyị sịrị, “Aga m esi nʼụwa kpochapụ mmadụ niile m kere eke. E e, mmadụ na anụmanụ niile, na ihe e kere eke na-akpụgharị nʼelu ala, na anụ ufe niile. Nʼihi na o wutere m na m kere ha.” 8Ma Noa nwetara ihuọma nʼanya Onyenwe anyị. 9Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya.
Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya. 10Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet. 11Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.