Jenesis 6:11
Genesis 6:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike.
Genesis 6:11 in English
Genesis 6:11 · Berean Standard Bible
Now the earth was corrupt in the sight of God, and full of violence.
Context
9Nke a bụ akụkọ banyere usoro ndụ Noa na ezinaụlọ ya.
Noa bụ onye ezi omume. Onye na-enweghị ịta ụta ọbụla nʼetiti ndị bi nʼoge ya. O mere ihe nʼụzọ Chineke chọrọ ya. 10Noa mụtara ụmụ ndị ikom atọ aha ha bụ, Shem, Ham, na Jafet. 11Ma nʼanya Chineke, ụwa bụ ihe rụrụ arụ, jupụtakwa nʼihe ike. 12Chineke hụrụ otu ụwa si jọgbuo onwe ya na njọ, hụkwa na ụmụ mmadụ bụ ndị ihe ọjọọ riri ahụ. 13Chineke sịrị Noa, “Aga m ebibi ihe niile bụ mmadụ, nʼihi na ụwa jupụtara nʼihe ike nʼihi omume mmadụ. E e, aga m ebibi ụwa na ndị niile nọ nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.