Jenesis 49:7
Genesis 49:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
Genesis 49:7 in English
Genesis 49:7 · Berean Standard Bible
Cursed be their anger, for it is strong, and their wrath, for it is cruel! I will disperse them in Jacob and scatter them in Israel.
Context
5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.
Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. 6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. 7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.
Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.
Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,
i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.
Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,
dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.