Jenesis 49:5
Genesis 49:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike.
Genesis 49:5 in English
Genesis 49:5 · Berean Standard Bible
Simeon and Levi are brothers; their swords * are weapons of violence.
Context
3“Ruben, ọkpara m ka ị bụ,
ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m,
onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike. 4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,
nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị,
i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya. 5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.
Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. 6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. 7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.