Jenesis 49:4
Genesis 49:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya.
Genesis 49:4 in English
Genesis 49:4 · Berean Standard Bible
Uncontrolled as the waters, you will no longer excel, because you went up to your father’s bed, onto my couch, and defiled it.
Context
2“Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb
nụrụ okwu nna unu Izrel. 3“Ruben, ọkpara m ka ị bụ,
ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m,
onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike. 4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,
nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị,
i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya. 5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.
Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. 6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.