Jenesis 49:6
Genesis 49:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche.
Genesis 49:6 in English
Genesis 49:6 · Berean Standard Bible
May I never enter their council; may I never join their assembly. For they kill men in their anger, and hamstring oxen on a whim.
Context
4Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ,
nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị,
i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya. 5“Simiọn na Livayị bụ ụmụnne.
Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. 6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. 7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.
Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.
Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.