Jenesis 49:8
Genesis 49:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị.
Genesis 49:8 in English
Genesis 49:8 · Berean Standard Bible
Judah,* your brothers shall praise you. Your hand shall be on the necks of your enemies; your father’s sons shall bow down to you.
Context
6Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha,
ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha,
nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha,
bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. 7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.
Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.
Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,
i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.
Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,
dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? 10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,
maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ,
tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa,
irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.