Jenesis 49:9
Genesis 49:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya?
Genesis 49:9 in English
Genesis 49:9 · Berean Standard Bible
Judah is a young lion— my son, you return from the prey. Like a lion he crouches and lies down; like a lioness, who dares to rouse him?
Context
7Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ.
Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke.
Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb
Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. 8“Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị.
Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị.
Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. 9Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda,
i si nʼịchụ nta lọta, nwa m.
Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala,
dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? 10Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya,
maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ,
tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa,
irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya. 11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị,
nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya.*
Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya.
Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.