Jenesis 49:13
Genesis 49:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn.
Genesis 49:13 in English
Genesis 49:13 · Berean Standard Bible
Zebulun shall dwell by the seashore and become a harbor for ships; his border shall extend to Sidon.
Context
11Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị,
nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya.*
Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya.
Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị. 12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị.
Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi. 13“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri.
Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri.
Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn. 14“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu
na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ. 15Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma,
hụ otu ala ya si maa mma,
ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ;
were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.