Native Bible

Genesis 49:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ.

Genesis 49:14 in English

Genesis 49:14 · Berean Standard Bible

Issachar is a strong donkey, lying down between the sheepfolds.*

Context

12Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi. 13“Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn. 14“Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ. 15Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike. 16“Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.