Izikiel 7:22
Ezekiel 7:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
Ezekiel 7:22 in English
Ezekiel 7:22 · Berean Standard Bible
I will turn My face away from them, and they will defile My treasured place. Violent men will enter it, and they will defile it.
Context
20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga,
ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche.
Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya;
ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ. 21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata
ndị ga-emerụ ya. 22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa.
Ha ga-abata nʼime ya
merụọkwa ya. 23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara,
obodo ahụ jupụtara nʼihe ike. 24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile.
Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị,
meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.