Native Bible

Ezekiel 7:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.

Ezekiel 7:21 in English

Ezekiel 7:21 · Berean Standard Bible

And I will hand these things over as plunder to foreigners and loot to the wicked of the earth, who will defile them.

Context

19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie. 20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ. 21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya. 22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya. 23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.