Izikiel 7:19
Ezekiel 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
Ezekiel 7:19 in English
Ezekiel 7:19 · Berean Standard Bible
They will throw their silver into the streets, and their gold will seem unclean. Their silver and gold cannot save them in the day of the wrath of the LORD. They cannot satisfy their appetites or fill their stomachs with wealth, for it became the stumbling block that brought their iniquity.
Context
17Aka niile ga-akụda,
ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee. 18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe,
oke ihe egwu ga-ekpuchi ha.
Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi,
a ga-akpụchakwa isi niile. 19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile,
ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
agaghị enwe ike napụta ha
nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị.
Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha,
maọbụ mee ka afọ ju ha,
nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie. 20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga,
ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche.
Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya;
ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ. 21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata
ndị ga-emerụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.