Native Bible

Ezekiel 7:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.

Ezekiel 7:18 in English

Ezekiel 7:18 · Berean Standard Bible

They will put on sackcloth, and terror will overwhelm them. Shame will cover all their faces, and all their heads will be shaved.

Context

16Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha. 17Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee. 18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile. 19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie. 20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.