Izikiel 7:16
Ezekiel 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
Ezekiel 7:16 in English
Ezekiel 7:16 · Berean Standard Bible
The survivors will escape and live in the mountains, moaning like doves of the valley, each for his own iniquity.
Context
14“ ‘Ha afụọla opi ike,
ha edoziela ihe niile
ma o nweghị onye ga-aga ibu agha
nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile. 15Mma agha dị nʼezi;
ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime.
Onye nọ nʼọhịa
ga-anwụ site na mma agha,
ndị nọ nʼime obodo ukwu
ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa. 16Ma ndị gbapụrụ agbapụ
ga-agbaga nọrọ nʼugwu.
Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu,
ha niile ga-asụ ude akwa,
onye ọbụla nʼihi mmehie ha. 17Aka niile ga-akụda,
ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee. 18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe,
oke ihe egwu ga-ekpuchi ha.
Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi,
a ga-akpụchakwa isi niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.