Izikiel 7:14
Ezekiel 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
Ezekiel 7:14 in English
Ezekiel 7:14 · Berean Standard Bible
They have blown the trumpet and made everything ready, but no one goes to war, for My wrath is upon the whole multitude.
Context
12Mgbe ahụ abịala!
Ụbọchị ahụ abịakwala nso.
Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ
ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ,
nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile. 13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi
ngwa ahịa nke erere ere
ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ.
Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile
bụ nke a na-apụghị ịgbanwe.
Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha
nke pụrụ ichebe ndụ ya. 14“ ‘Ha afụọla opi ike,
ha edoziela ihe niile
ma o nweghị onye ga-aga ibu agha
nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile. 15Mma agha dị nʼezi;
ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime.
Onye nọ nʼọhịa
ga-anwụ site na mma agha,
ndị nọ nʼime obodo ukwu
ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa. 16Ma ndị gbapụrụ agbapụ
ga-agbaga nọrọ nʼugwu.
Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu,
ha niile ga-asụ ude akwa,
onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.