Native Bible

Ezekiel 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.

Ezekiel 7:15 in English

Ezekiel 7:15 · Berean Standard Bible

The sword is outside; plague and famine are within. Those in the country will die by the sword, and those in the city will be devoured by famine and plague.

Context

13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya. 14“ ‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile. 15Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa. 16Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha. 17Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.