Izikiel 7:13
Ezekiel 7:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
Ezekiel 7:13 in English
Ezekiel 7:13 · Berean Standard Bible
The seller will surely not recover what he sold while both remain alive. For the vision concerning the whole multitude will not be revoked, and because of their iniquity, not one of them will preserve his life.
Context
11Ihe ike ebilitala,
mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ.
O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ,
maọbụ igwe mmadụ
maọbụ ụba ha,
o nweghịkwa nke bara uru. 12Mgbe ahụ abịala!
Ụbọchị ahụ abịakwala nso.
Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ
ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ,
nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile. 13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi
ngwa ahịa nke erere ere
ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ.
Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile
bụ nke a na-apụghị ịgbanwe.
Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha
nke pụrụ ichebe ndụ ya. 14“ ‘Ha afụọla opi ike,
ha edoziela ihe niile
ma o nweghị onye ga-aga ibu agha
nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile. 15Mma agha dị nʼezi;
ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime.
Onye nọ nʼọhịa
ga-anwụ site na mma agha,
ndị nọ nʼime obodo ukwu
ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.