Izikiel 7:11
Ezekiel 7:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
Ezekiel 7:11 in English
Ezekiel 7:11 · Berean Standard Bible
Their violence has grown into a rod to punish their wickedness.* None of them will remain: none of their multitude, none of their wealth, and nothing of value.
Context
9Agaghị m emere gị ebere,
agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ.
Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a. 10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
Lee, ka ọ na-abịa!
Oke nsogbu enupụtala,
mkpanaka agbala okoko
nganga amaala ifuru!* 11Ihe ike ebilitala,
mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ.
O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ,
maọbụ igwe mmadụ
maọbụ ụba ha,
o nweghịkwa nke bara uru. 12Mgbe ahụ abịala!
Ụbọchị ahụ abịakwala nso.
Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ
ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ,
nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile. 13Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi
ngwa ahịa nke erere ere
ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ.
Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile
bụ nke a na-apụghị ịgbanwe.
Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha
nke pụrụ ichebe ndụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.