Izikiel 7:9
Ezekiel 7:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
Ezekiel 7:9 in English
Ezekiel 7:9 · Berean Standard Bible
I will not look on you with pity, nor will I spare you, but I will punish you for your ways and for the abominations among you. Then you will know that it is I, the LORD, who strikes the blow.
Context
7Oke nsogbu abịakwasịla gị,
gị onwe gị bi nʼala ahụ.
Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso!
Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile. 8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ
mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile.
Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile. 9Agaghị m emere gị ebere,
agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ.
Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a. 10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
Lee, ka ọ na-abịa!
Oke nsogbu enupụtala,
mkpanaka agbala okoko
nganga amaala ifuru!* 11Ihe ike ebilitala,
mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ.
O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ,
maọbụ igwe mmadụ
maọbụ ụba ha,
o nweghịkwa nke bara uru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.