Izikiel 7:8
Ezekiel 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
Ezekiel 7:8 in English
Ezekiel 7:8 · Berean Standard Bible
Very soon I will pour out My wrath upon you and vent My anger against you; I will judge you according to your ways and repay you for all your abominations.
Context
6Ọgwụgwụ abịala!
Ọgwụgwụ abịala!
Ọ kpalitela onwe ya imegide unu.
Lee, ka ọ na-abịa! 7Oke nsogbu abịakwasịla gị,
gị onwe gị bi nʼala ahụ.
Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso!
Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile. 8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ
mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile.
Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile. 9Agaghị m emere gị ebere,
agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ.
Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a. 10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
Lee, ka ọ na-abịa!
Oke nsogbu enupụtala,
mkpanaka agbala okoko
nganga amaala ifuru!*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.