Izikiel 7:10
Ezekiel 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!*
Ezekiel 7:10 in English
Ezekiel 7:10 · Berean Standard Bible
Behold, the day is here! It has come! Doom has gone out, the rod has budded, arrogance has bloomed.
Context
8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ
mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile.
Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile. 9Agaghị m emere gị ebere,
agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ.
Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị,
kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a. 10“ ‘Lee, ụbọchị ahụ!
Lee, ka ọ na-abịa!
Oke nsogbu enupụtala,
mkpanaka agbala okoko
nganga amaala ifuru!* 11Ihe ike ebilitala,
mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ.
O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ,
maọbụ igwe mmadụ
maọbụ ụba ha,
o nweghịkwa nke bara uru. 12Mgbe ahụ abịala!
Ụbọchị ahụ abịakwala nso.
Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ
ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ,
nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.