Native Bible

Ezekiel 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa!

Ezekiel 7:6 in English

Ezekiel 7:6 · Berean Standard Bible

The end has come! The end has come! It has roused itself against you. Behold, it has come!

Context

4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa. 6Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa! 7Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile. 8Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.