Izikiel 7:4
Ezekiel 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Ezekiel 7:4 in English
Ezekiel 7:4 · Berean Standard Bible
I will not look on you with pity, nor will I spare you, but I will punish you for your ways and for the abominations among you. Then you will know that I am the LORD.’
Context
2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel:
“ ‘Ọgwụgwụ!
Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ. 3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu.
Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu;
aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị,
aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile. 4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ,
agaghị m emekwara gị ebere,
kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu
na arụ niile dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ.
Lee, ka ọ na-abịa. 6Ọgwụgwụ abịala!
Ọgwụgwụ abịala!
Ọ kpalitela onwe ya imegide unu.
Lee, ka ọ na-abịa!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.