Izikiel 7:2
Ezekiel 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “ ‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
Ezekiel 7:2 in English
Ezekiel 7:2 · Berean Standard Bible
“O son of man, this is what the Lord GOD says to the land of Israel: ‘The end! The end has come upon the four corners of the land.
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel:
“ ‘Ọgwụgwụ!
Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ. 3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu.
Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu;
aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị,
aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile. 4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ,
agaghị m emekwara gị ebere,
kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu
na arụ niile dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.