Izikiel 7:5
Ezekiel 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.
Ezekiel 7:5 in English
Ezekiel 7:5 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: ‘Disaster! An unprecedented disaster *— behold, it is coming!
Context
3Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu.
Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu;
aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị,
aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile. 4Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ,
agaghị m emekwara gị ebere,
kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu
na arụ niile dị nʼetiti unu.
“ ‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ 5“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,
“ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ.
Lee, ka ọ na-abịa. 6Ọgwụgwụ abịala!
Ọgwụgwụ abịala!
Ọ kpalitela onwe ya imegide unu.
Lee, ka ọ na-abịa! 7Oke nsogbu abịakwasịla gị,
gị onwe gị bi nʼala ahụ.
Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso!
Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.