Izikiel 7:20
Ezekiel 7:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
Ezekiel 7:20 in English
Ezekiel 7:20 · Berean Standard Bible
His beautiful ornaments they transformed into pride and used them to fashion their vile images and detestable idols. Therefore I will make these into something unclean for them.
Context
18Ha ga-eyikwasị akwa mkpe,
oke ihe egwu ga-ekpuchi ha.
Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi,
a ga-akpụchakwa isi niile. 19“ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile,
ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha.
Ọlaọcha na ọlaedo ha
agaghị enwe ike napụta ha
nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị.
Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha,
maọbụ mee ka afọ ju ha,
nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie. 20Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga,
ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche.
Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya;
ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ. 21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata
ndị ga-emerụ ya. 22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa.
Ha ga-abata nʼime ya
merụọkwa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.