Izikiel 7:23
Ezekiel 7:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
Ezekiel 7:23 in English
Ezekiel 7:23 · Berean Standard Bible
Forge the chain, for the land is full of crimes of bloodshed, and the city is full of violence.
Context
21Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha,
nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata
ndị ga-emerụ ya. 22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa.
Ha ga-abata nʼime ya
merụọkwa ya. 23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara,
obodo ahụ jupụtara nʼihe ike. 24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile.
Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị,
meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ. 25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara,
ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.