Izikiel 7:25
Ezekiel 7:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
Ezekiel 7:25 in English
Ezekiel 7:25 · Berean Standard Bible
Anguish is coming! They will seek peace, but find none.
Context
23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara,
obodo ahụ jupụtara nʼihe ike. 24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile.
Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị,
meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ. 25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara,
ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị. 26Mbibi ga-esochi mbibi,
akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi.
Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma,
ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị,
ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa. 27Eze ga-eru ụjụ,
nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe,
aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu.
Aga m emeso ha dịka omume ha si dị,
aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị.
“ ‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
7:10 Ya bụ, na nganga na-abawanye
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.