Izikiel 7:24
Ezekiel 7:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
Ezekiel 7:24 in English
Ezekiel 7:24 · Berean Standard Bible
So I will bring the most wicked of nations to take possession of their houses. I will end the pride of the mighty, and their holy places will be profaned.
Context
22Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m
ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa.
Ha ga-abata nʼime ya
merụọkwa ya. 23“ ‘Kwadoonụ ụdọ igwe.
Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara,
obodo ahụ jupụtara nʼihe ike. 24Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha
ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile.
Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị,
meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ. 25Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara,
ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị. 26Mbibi ga-esochi mbibi,
akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi.
Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma,
ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị,
ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.