Native Bible

Ezekiel 30:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.

Ezekiel 30:3 in English

Ezekiel 30:3 · Berean Standard Bible

For the day is near, the Day of the LORD is near. It will be a day of clouds, a time of doom for the nations.*

Context

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!” 3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi. 5Kush* na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.