Izikiel 30:2
Ezekiel 30:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
Ezekiel 30:2 in English
Ezekiel 30:2 · Berean Standard Bible
“Son of man, prophesy and declare that this is what the Lord GOD says: Wail, ‘Alas for that day!’
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,
“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!” 3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,
Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,
ụbọchị igwe ojii,
ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,
ihe mgbu ga-adakwasị Kush.
Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,
a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,
mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.