Izikiel 30:4
Ezekiel 30:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
Ezekiel 30:4 in English
Ezekiel 30:4 · Berean Standard Bible
A sword will come against Egypt, and there will be anguish in Cush * when the slain fall in Egypt, its wealth is taken away, and its foundations are torn down.
Context
2“Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,
“ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị,
“Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!” 3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,
Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,
ụbọchị igwe ojii,
ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,
ihe mgbu ga-adakwasị Kush.
Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,
a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,
mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi. 5Kush* na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha. 6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,
nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.
Site na Migdol ruo nʼAswan,
ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.*
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.