Izikiel 30:5
Ezekiel 30:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kush* na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
Ezekiel 30:5 in English
Ezekiel 30:5 · Berean Standard Bible
Cush, Put, and Lud,* and all the various peoples, as well as Libya and the men of the covenant land, will fall with Egypt by the sword.
Context
3Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso,
Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso,
ụbọchị igwe ojii,
ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4Mma agha ga-abịakwasị Ijipt,
ihe mgbu ga-adakwasị Kush.
Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala,
a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya,
mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi. 5Kush* na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha. 6“ ‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:
“ ‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada,
nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa.
Site na Migdol ruo nʼAswan,
ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya.*
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 7Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,
nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.
Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,
nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.