Izikiel 30:15
Ezekiel 30:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
Ezekiel 30:15 in English
Ezekiel 30:15 · Berean Standard Bible
I will pour out My wrath on Pelusium,* the stronghold of Egypt, and cut off the crowds of Thebes.
Context
13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,
mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.
Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,
aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile. 14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.
Aga m etinye ọkụ na Zoan,
ma taa Tibs ahụhụ. 15M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m,
bụ ebe siri ike nke Ijipt,
m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,
Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.
A ga-eji ike tipịa Tibs.
Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile. 17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti
ga-anwụ site na mma agha.
Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.