Izikiel 30:14
Ezekiel 30:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.
Ezekiel 30:14 in English
Ezekiel 30:14 · Berean Standard Bible
I will lay waste Pathros, set fire to Zoan, and execute judgment on Thebes.*
Context
12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.
Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.
Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. 13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,
mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.
Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,
aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile. 14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.
Aga m etinye ọkụ na Zoan,
ma taa Tibs ahụhụ. 15M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m,
bụ ebe siri ike nke Ijipt,
m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,
Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.
A ga-eji ike tipịa Tibs.
Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.