Izikiel 30:13
Ezekiel 30:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
Ezekiel 30:13 in English
Ezekiel 30:13 · Berean Standard Bible
This is what the Lord GOD says: I will destroy the idols and put an end to the images in Memphis.* There will no longer be a prince in Egypt, and I will instill fear in that land.
Context
11Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,
ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,
werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ. 12Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.
Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.
Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. 13“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,
mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.
Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt,
aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile. 14Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu.
Aga m etinye ọkụ na Zoan,
ma taa Tibs ahụhụ. 15M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m,
bụ ebe siri ike nke Ijipt,
m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.