Native Bible

Ezekiel 30:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.

Ezekiel 30:17 in English

Ezekiel 30:17 · Berean Standard Bible

The young men of On and Pi-beseth * will fall by the sword, and those cities will go into captivity.

Context

15M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile. 17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha. 18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.