Izikiel 30:17
Ezekiel 30:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
Ezekiel 30:17 in English
Ezekiel 30:17 · Berean Standard Bible
The young men of On and Pi-beseth * will fall by the sword, and those cities will go into captivity.
Context
15M ga-awụkwasị Pelusium* ọnụma m,
bụ ebe siri ike nke Ijipt,
m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt,
Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu.
A ga-eji ike tipịa Tibs.
Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile. 17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti
ga-anwụ site na mma agha.
Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha. 18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis
mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,
nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.
Igwe ojii ga-ekpuchi ya,
a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,
ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.