Izikiel 30:19
Ezekiel 30:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Ezekiel 30:19 in English
Ezekiel 30:19 · Berean Standard Bible
So I will execute judgment on Egypt, and they will know that I am the LORD.”
Context
17Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti
ga-anwụ site na mma agha.
Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha. 18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis
mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,
nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.
Igwe ojii ga-ekpuchi ya,
a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,
ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.