Izikiel 30:20
Ezekiel 30:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ezekiel 30:20 in English
Ezekiel 30:20 · Berean Standard Bible
In the eleventh year, on the seventh day of the first month, the word of the LORD came to me, saying,
Context
18Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis
mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt,
nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị.
Igwe ojii ga-ekpuchi ya,
a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu,
ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 20O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21“Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.