Izikiel 28:5
Ezekiel 28:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, mmụta nʼịzụ ahịa gị emeela ka ị ghọọ ọgaranya, nʼihi akụnụba inwere ị bụrụla onye na-akpa nganga.
Ezekiel 28:5 in English
Ezekiel 28:5 · Berean Standard Bible
By your great skill in trading you have increased your wealth, but your heart has grown proud because of it.
Context
3Ị maara ihe karịa Daniel?
Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ? 4I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche. 5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
emeela ka ị ghọọ ọgaranya,
nʼihi akụnụba inwere
ị bụrụla onye na-akpa nganga. 6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;
“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe
onye maara ihe dịka chi, 7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,
bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,
ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.