Izikiel 28:3
Ezekiel 28:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị maara ihe karịa Daniel? Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?
Ezekiel 28:3 in English
Ezekiel 28:3 · Berean Standard Bible
Behold, you are wiser than Daniel; no secret is hidden from you!
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,
ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,
mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,
nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,*
ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.* 3Ị maara ihe karịa Daniel?
Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ? 4I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche. 5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
emeela ka ị ghọọ ọgaranya,
nʼihi akụnụba inwere
ị bụrụla onye na-akpa nganga.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.