Izikiel 28:2
Ezekiel 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi, ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi, mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi, nke dị nʼetiti oke osimiri niile.” Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,* ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.*
Ezekiel 28:2 in English
Ezekiel 28:2 · Berean Standard Bible
“Son of man, tell the ruler of Tyre that this is what the Lord GOD says: Your heart is proud, and you have said, ‘I am a god; I sit in the seat of gods in the heart of the sea.’ Yet you are a man and not a god, though you have regarded your heart as that of a god.
Context
1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,
ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,
mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,
nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,*
ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.* 3Ị maara ihe karịa Daniel?
Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ? 4I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.