Izikiel 28:4
Ezekiel 28:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I werela amamihe gị na nghọta gị nwetara onwe gị akụ, tụkọba ọlaedo na ọlaọcha, nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.
Ezekiel 28:4 in English
Ezekiel 28:4 · Berean Standard Bible
By your wisdom and understanding you have gained your wealth and amassed gold and silver for your treasuries.
Context
2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:
“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,
ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,
mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,
nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”
Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,*
ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.* 3Ị maara ihe karịa Daniel?
Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ? 4I werela amamihe gị na nghọta gị
nwetara onwe gị akụ,
tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,
nʼime ụlọakụ gị dị iche iche. 5E, mmụta nʼịzụ ahịa gị
emeela ka ị ghọọ ọgaranya,
nʼihi akụnụba inwere
ị bụrụla onye na-akpa nganga. 6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;
“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara ihe
onye maara ihe dịka chi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.